1 Chronicles 26

Ndị nche ọnụ ụzọ

1Usoro otu ndị nche ọnụ ụzọ ụlọnsọ ahụ.

Site na ndị Kora:
Meshelemaia, nwa Kore, otu nʼime ụmụ Asaf.
2Meshelemaia nwekwara ụmụ ndị ikom:
nke mbụ bụ Zekaraya, na Jediael nke abụọ,
Zebadaya, bụ nke atọ, Jatniel, nke anọ
3Elam, nke ise na Jehohanan, bụ nke isii
na Eliehoenai bụ onye nke asaa.
4Obed-Edọm nwekwara ụmụ ndị ikom. Ha bụ ndị a:
Shemaya, nwa mbụ ya, Jehozabad, osote ya,
Joa, nke atọ, Saka, bụ onye nke anọ
Netanel, nke ise,
5Amiel, nke isii
Isaka, nke asaa na Peuletai, onye bụ onye nke asatọ.
Nʼihi na Chineke gọziri Obed-Edọm.
6Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa. 7Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ,
Otni, Refael, Obed na Elzabad;
ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa.
8Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ.
9E sitekwara nʼezinaụlọ Meshelemaia họpụta ndịisi iri na asatọ (18) ndị bụkwa ezi ndị ndu.

10Hosa, nwa Merari nwekwara ụmụ ndị ikom:
Shimri onye nke mbụ (ọ bụ ezie na ọ bụghị ọkpara ya ma nna ya họpụtara ya ka ọ bụrụ onye mbụ).
11Hilkaya, nke abụọ, Tebalaya, nke atọ
na Zekaraya onye nke anọ.
Ụmụ ndị ikom na ụmụnne Hosa nwere dị iri na atọ (13).

12E kere ndị nche ụlọnsọ ukwu niile nʼotu nʼotu. Otu ndị a nwekwara ndịisi. E kenyekwara otu ọbụla ọrụ dịka e si kenye ụmụnna ha ọrụ ha nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 13E sitere nʼife nza kenye ma nwantakịrị ma okenye, ọnụ ụzọ ha ga-eche nche, dịka ezinaụlọ ha si dị.
14Site nʼife nza, Shelemaya ketara iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ nche.
Zekaraya nwa ya, onye ndụmọdụ nwere uche, sitekwara nʼife nza keta iche ọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ugwu, ya na ndị otu ya.
15Obed-Edọm na ndị otu ya na-eche ụzọ dị na ndịda. Ụmụ ya bụ ndị na-eche ụlọ ebe a na-achịkọta ihe.
16Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu.

Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha.
17Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile.
Mmadụ anọ na-anọ nʼugwu,
anọ na ndịda,
abụọ nʼebe a na-achịkọbata ihe.
18Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.

19A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari.

Ndị nche ụlọakụ na ndị ọrụ ọzọ

20Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke.

21Ndị agbụrụ Ladan, ndị si nʼikwu Geshọn, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ nna ha Ladan, bụ onye Geshọn, bụ Jehieli, 22na ụmụ ndị ikom Jehieli, Zetam na nwanne ya nwoke Juel. Ndị a bụ ndị na-elekọta ụlọakụ niile dị nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.

23Site na ndị Amram, na ndị Izha, na ndị Hebrọn, na ndị Uziel.

24Shubuel nwa Geshọm, na nwa nwa Mosis ka e nyere ọrụ ịbụ onyeisi ụlọakụ dị nʼụlọnsọ ahụ. 25Ụmụnna ya site na Elieza bụ ndị a, Rehabaya nwa ya nwoke, Jeshaya nwa nwoke Rehabaya, Joram nwa nwoke Jeshaya na Zikri nwa nwoke Shelomit.
26Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị nʼaka ilekọta ụlọakụ nke ihe nsọ niile, nke Devid bụ eze, na ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi agha ndị ọzọ, doro nsọ. 27Ụfọdụ ihe agha na ihe sitere nʼihe a kwatara nʼagha ka ha doro nsọ maka idozi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. 28Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha.
29Site nʼikwu Izha,
Kenaniya, na ụmụ ndị ikom ya ka ozi dịrị pụọ nʼụlọnsọ, dịka ndịisi na ndị ikpe nye ndị Izrel.
30Site na ndị Hebrọn,
Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka.
31Jeraya bụ onyendu ndị Hebrọn, dịka akwụkwọ e dekọrọ usoro ọmụmụ si gosi.
Nʼihi na nʼafọ nke iri anọ nke ọchịchị eze Devid nʼIzrel, ka e mere nnyocha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ chọpụta na e nwere ndị dị ike ọrụ nʼetiti ndị Hebrọn. A chọpụtara ndị a nʼobodo Jeza nke dị na Gilead.
32Jeraya nwere ndị ikwu ya, ndị bụ dimkpa, na ndị dị ike ọrụ, ọnụọgụgụ ha dị puku abụọ na narị asaa. Ndị a niile bụkwa ndị ndu ezinaụlọ dị iche iche. Ya mere, Devid, eze Izrel, mere ha ndịisi ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase. Ọrụ ha bụ ilekọta ihe banyere ofufe Chineke na ije ozi niile metụtara eze.
Copyright information for IboBIU